Job 30

1“Ma ugbu a, ha na-akwa m emo
bụ ndị bụ ụmụntakịrị nʼebe m nọ,
bụ ndị nna ha na-etorughị ndị m na-ezipụ
ka ha na nkịta na-eso atụrụ m nọkọta.
2Uru gịnị ka ike aka ha ga-abara m,
ebe ọ bụ na ha adịghịkwa ike?
3Ha bụ ndị ike gwụrụ site nʼụkọ na agụụ,
ha na-agagharị nʼala kpọrọ nkụ
na-awagharịkwa nʼime ọzara nʼabalị.
4Nʼala ọhịa ka ha na-atụrị ahịhịa nnu,
mgbọrọgwụ osisi brum bụkwa nri ha.
5A chụpụrụ ha site nʼetiti ndị mmadụ ibe ha,
a na-etiso ha mkpu dịka ha bụ ndị ohi.
6A chụpụrụ ha ka ha gaa biri nʼala iyi mmiri na-adịghị.
Ha bi nʼetiti ọgba nkume na ọnụ a tụrụ nʼime ala.
7Ha na-eme ụzụ nʼọhịa dịka ụmụ anụmanụ,
na-ejikọta onwe ha nʼahịhịa toro nʼokpuru osisi.
8Ha bụ ndị e ledara anya, ndị na-enweghị aha,
e sitere nʼala ahụ chụpụ ha.

9“Ma ugbu a, abụrụla m ihe ụmụ okorobịa ji abụ abụ ịkwa emo;
abụrụkwala m okwu ha ji anọpụrụ ụbọchị.
10Abụ m ihe ịsọ oyi nye ha, ha adịghị abịakwa m nso;
ha anaghị egbu oge igbu m asọ mmiri nʼihu.
11Ma ugbu a, ebe ọ bụ na Chineke atọpụla eriri ụta m ma kpagbuo m,
o nwekwaghị ihe ha na-adịghị eme nʼihu m.
12Nʼaka nri m mba ndị a na-ebuso m agha.
Ha na-esiri ụkwụ m ọnya,
ha na-ewuli mgbidi ha nọchibido m.
13Ha na-etiwasị ụzọ m,
ha kwadoro mmekpa ahụ m.
‘O nweghị onye ga-enyere ya aka,’ ka ha na-ekwu.
14Ha na-abịakwasị m dịka ndị sitere ebe e tipuru mgbidi;
nʼetiti mbibi ya ha na-enu onwe ha enute nʼebe m nọ.
15Oke egwu abịakwasịla m;
ugwu m adịla ka ihe ifufe buuru,
nchekwa m agabigala dịka igwe ojii.

16“Ugbu a, ndụ m ji nwayọọ nwayọọ na-agabiga;
ụbọchị ahụhụ ejidela m.
17Abalị na-esewasị ọkpụkpụ m,
ihe mgbu m nke na-ata ata enweghị ezumike.
18Nʼoke ike ya, Chineke na-adịrị m ka uwe;
ọ na-ekechi m dịka olu uwe m.
19Ọ na-atụba m nʼime apịtị,
mee ka m ghọọ ntụ na aja.

20“Chineke m, anam etiku gị ma ị dịghị aza m;
anam eguzo ọtọ, ma naanị anya ka i lere m.
21Ị na-emegide m na-enweghị obi ebere;
i ji aka gị dị ike megide m.
22Ị na-ejide m nʼike welie m elu chụba m nʼoke ifufe,
ị na-eme ka m bụrụ onye na-akwụfegharị nʼoke ifufe nke mmiri.
23Amara m na ị ga-eweda m ruo ọnwụ;
ruo nʼebe e debeere mmadụ niile dị ndụ.

24“Nʼezie, ọ dịghị onye na-emegide onye e tidara nʼala;
mgbe ọ na-eti mkpu nʼọnọdụ nhụju anya ya na-achọ enyemaka.
25Ọ bụ na m akwaghị akwa nʼihi ndị nọ na nsogbu;
ọ bụ na mmụọ m erughị ụjụ nʼihi ndị ogbenye?
26Ma mgbe m lere anya ihe ọma, ihe ọjọọ bịara;
mgbe m lere anya ìhè, mgbe ahụ ka ọchịchịrị bịara.
27Obi m anaghị ezu ike nʼime m;
ụbọchị ahụhụ na-ezute m.
28Ana m agagharị na-eji nji ma ọ bụghị nʼihi oke anwụ.
Eguzola m ọtọ nʼọgbakọ ndị mmadụ tikuo ha ka ha nyere m aka.
29Abụrụla m nwanne nkịta ọhịa;
onye ya na ikwighịkwighị na-esogharị.
30Akpụkpọ ahụ m na-eji nji na-ekpe iwere;
anụ ahụ m na-anụ ọkụ dịka ihe a kwanyere ọkụ.
31Ụda ụbọ akwara m bụ ụda iru ụjụ;
ụda ọja m bụkwa ụda iti mkpu akwa.
Copyright information for IboBIU